2 Ndị Eze 19:29
2 Kings 19:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
2 Kings 19:29 in English
2 Kings 19:29 · Berean Standard Bible
And this will be a sign to you, O Hezekiah: This year you will eat what grows on its own, and in the second year what springs from the same. But in the third year you will sow and reap; you will plant vineyards and eat their fruit.
Context
27“ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị
marakwa oke iwe gị megide m. 28Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko m nʼimi gị
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’ 29“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya:
“Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi;
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 30Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 31Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta;
otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta.
“Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.