2 Ndị Eze 19:31
2 Kings 19:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
2 Kings 19:31 in English
2 Kings 19:31 · Berean Standard Bible
For a remnant will go forth from Jerusalem, and survivors from Mount Zion. The zeal of the LORD of Hosts * will accomplish this.
Context
29“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya:
“Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi;
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 30Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 31Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta;
otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta.
“Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a. 32“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị,
“ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a
maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a.
Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya,
maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 33Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;
ọ gaghị abanye nʼobodo a.
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.