2 Ihe E Mere 17:15
2 Chronicles 17:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ (280,000),
2 Chronicles 17:15 in English
2 Chronicles 17:15 · Berean Standard Bible
next to him, Jehohanan the commander, and with him 280,000;
Context
13O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem. 14Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị:
Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha (1,000),
Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ (300,000), 15onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ (280,000), 16ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu* nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000). 17Ndị si Benjamin,
Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ (200,000), ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.