1 Samuel 8:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya.* Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha.* Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.*
1 Samuel 8:3 in English
1 Samuel 8:3 · Berean Standard Bible
But his sons did not walk in his ways; they turned aside toward dishonest gain, accepting bribes and perverting justice.
Context
1Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel. 2Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe. 3Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya.* Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha.* Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.* 4Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya, 5“I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.