Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.”

1 Samuel 8:5 in English

1 Samuel 8:5 · Berean Standard Bible

“Look,” they said, “you are old, and your sons do not walk in your ways. Now appoint a king to judge us like all the other nations.”

Context

3Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya.* Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha.* Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.* 4Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya, 5“I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.” 6Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere. 7Onyenwe anyị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.