Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị, “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?”

1 Samuel 29:5 in English

1 Samuel 29:5 · Berean Standard Bible

Is this not the David about whom they sing in their dances: ‘Saul has slain his thousands, and David his tens of thousands’?”

Context

3Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?” Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.” 4Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?” 5Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị, “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?” 6Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị. 7Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.