1 Samuel 29:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?”
1 Samuel 29:4 in English
1 Samuel 29:4 · Berean Standard Bible
But the commanders of the Philistines were angry with Achish and told him, “Send that man back and let him return to the place you assigned him. He must not go down with us into battle only to become our adversary during the war. What better way for him to regain the favor of his master than with the heads of our men?
Context
2Mgbe ndịisi agha ndị Filistia malitere ịgafesị ha na ndị agha ha, ụfọdụ nʼime ha du ọtụtụ narị ndị agha, ụfọdụ, ọtụtụ puku ndị agha, Devid na ndị agha ya so nʼazụ, ha na Akish, eze ndị Filistia. 3Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?”
Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.” 4Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?” 5Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị,
“ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya,
ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?” 6Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.