1 Samuel 29:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?” Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.”
1 Samuel 29:3 in English
1 Samuel 29:3 · Berean Standard Bible
Then the commanders of the Philistines asked, “What about these Hebrews?” Achish replied, “Is this not David, the servant of King Saul of Israel? He has been with me all these days, even years, and from the day he defected until today I have found no fault in him.”
Context
1Ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha bịaruo Afek, ma ndị agha Izrel zukọtara nʼakụkụ isi iyi Jezril. 2Mgbe ndịisi agha ndị Filistia malitere ịgafesị ha na ndị agha ha, ụfọdụ nʼime ha du ọtụtụ narị ndị agha, ụfọdụ, ọtụtụ puku ndị agha, Devid na ndị agha ya so nʼazụ, ha na Akish, eze ndị Filistia. 3Ndịisi agha ndị Filistia jụrụ eze Akish ajụjụ sị, “Gịnị ka ndị Hibru ndị a na-eme nʼebe a?”
Akish gwara ha sị, “Onye a ọ bụghị Devid, onyeozi si nʼaka Sọl eze ndị Izrel gbapụ? Mụ na ya ebiela ihe karịrị otu afọ, ma achọpụtaghị ihe ọbụla dị njọ nʼebe ọ nọ, site nʼụbọchị ahụ ọ hapụrụ Sọl ruo ugbu a.” 4Ma ndịisi agha ndị Filistia were iwe megide ya. Ha sịrị ya, “Zilaga nwoke a, ka ọ laghachi nʼọnọdụ ozi ebe i mere ya onye nlekọta. Anyị na ha agaghị eso jee nʼihu ọgụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-atụgharịa megide anyị nʼagha. Olee ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ya na nna ya ukwu dị na mma ma ọ bụghị site nʼigbu ndị agha anyị ndị a?” 5Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị,
“ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya,
ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.