Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.”

1 Samuel 29:7 in English

1 Samuel 29:7 · Berean Standard Bible

Therefore turn back now and go in peace, so that you will not do anything to displease the leaders of the Philistines.”

Context

5Onye a ọ bụghị Devid ahụ ndị inyom Izrel ji gụọ egwu sị, “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị iro’?” 6Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị. 7Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.” 8Devid jụrụ Akish, “Ma gịnị ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụtara megide ohu gị site nʼụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị ga-eme ka m ghara ịlụso ndị iro onyenwe m, bụ eze agha?” 9Akish zaghachiri, “Ama m nʼonye dị mma ka ị bụ nʼanya m, dịka mmụọ ozi nke Chineke. Nʼagbanyeghị nke a, ọchịagha ndị Filistia asịla, ‘Ọ gaghị eso anyị jee nʼagha.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.