1 Samuel 29:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid jụrụ Akish, “Ma gịnị ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụtara megide ohu gị site nʼụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị ga-eme ka m ghara ịlụso ndị iro onyenwe m, bụ eze agha?”
1 Samuel 29:8 in English
1 Samuel 29:8 · Berean Standard Bible
“But what have I done?” David replied. “What have you found against your servant, from the day I came to you until today, to keep me from going along to fight against the enemies of my lord the king?”
Context
6Ya mere, Akish kpọrọ Devid sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. Ọ gaara atọ m ụtọ ka ị soro m buo agha. Site na mgbe ị bịakwutere m tutu ruo ugbu a, o nweghị mmejọ ọbụla m chọpụtara nʼime gị. Ma ndịisi anyị anabataghị gị. 7Ugbu a, laghachinụ azụ, laa nʼudo. Unu emeela ihe ọbụla ga-akpasu ndịisi ndị Filistia iwe.” 8Devid jụrụ Akish, “Ma gịnị ka m mere? Gịnịkwa ka ị hụtara megide ohu gị site nʼụbọchị m bịakwutere gị ruo taa? Gịnị ga-eme ka m ghara ịlụso ndị iro onyenwe m, bụ eze agha?” 9Akish zaghachiri, “Ama m nʼonye dị mma ka ị bụ nʼanya m, dịka mmụọ ozi nke Chineke. Nʼagbanyeghị nke a, ọchịagha ndị Filistia asịla, ‘Ọ gaghị eso anyị jee nʼagha.’ 10Ya mere, bilie nʼisi ụtụtụ, gị na ndị ọrụ onyenwe gị ndị soro gị bịa, bilienụ nʼisi ụtụtụ laghachi mgbe ìhè dịrị unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.