Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ.

1 Samuel 26:23 in English

1 Samuel 26:23 · Berean Standard Bible

May the LORD repay every man for his righteousness and faithfulness. For the LORD delivered you into my hand today, but I would not stretch out my hand against the LORD’s anointed.

Context

21Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.” 22Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya. 23Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ. 24Ugbu a, ka Onyenwe anyị zọpụta ndụ m, ọ bụladị dịka m sị zọpụta ndụ nke gị taa. Ka ọ napụtakwa m site na mkpagbu m niile.” 25Sọl sịrị Devid, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nwa m, Devid. Ị ga-eme oke ihe, bụrụkwa onye na-emeri nʼagha.” Devid sitere nʼebe ahụ pụọ. Sọl laghachikwara nʼụlọ ya. 26:6 Zeruya bụ nwanne nwanyị Devid, onye toro ya nʼusoro ọmụmụ ha. Nke a dị nʼakwụkwọ 1Ih 2:16 Abishai na Joab, ndị bụ ndị ndu ndị agha, tinyere Asahel, bụ ụmụ nwanne nwanyị Devid, nʼihi na ọ bụ Zeruya mụrụ ha, gụọ nke a nʼakwụkwọ 2Sa 2:13,18,24

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.