Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya.

1 Samuel 26:22 in English

1 Samuel 26:22 · Berean Standard Bible

“Here is the king’s spear,” David answered. “Let one of the young men come over and get it.

Context

20Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu Onyenwe anyị. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.” 21Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.” 22Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya. 23Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ. 24Ugbu a, ka Onyenwe anyị zọpụta ndụ m, ọ bụladị dịka m sị zọpụta ndụ nke gị taa. Ka ọ napụtakwa m site na mkpagbu m niile.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.