Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.”

1 Samuel 26:21 in English

1 Samuel 26:21 · Berean Standard Bible

Then Saul replied, “I have sinned. Come back, David my son. I will never harm you again, because today you considered my life precious. I have played the fool and have committed a grave error!”

Context

19Ugbu a ka onyenwe m eze gee ntị nʼokwu ohu ya: Ọ bụrụ na Onyenwe anyị kpaliri gị imegide m, mgbe ahụ arịrịọ m bụ ka Onyenwe anyị nara onyinye ịnata ihuọma. Otu ọ dị, a si na ọ bụ ndị mmadụ na-akpali gị imegide m, ka ndị dị otu a bụrụ ndị a bụrụ ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi na ha esitela nʼoke m nwere nʼihe nketa Onyenwe anyị chụpụ m, sị m, ‘Gaa fee chi ndị ọzọ ofufe.’ 20Ugbu a, ekwela ka ọbara m bụrụ ihe a wufuru nʼala dị anya, na-abụghị nʼihu Onyenwe anyị. Eze Izrel apụtala ịchọ akpị dịka m, otu dinta si achọgharị ọkwa nʼelu ugwu.” 21Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Emehiela m. Lọghachi nʼụlọ nwa m Devid. Nʼihi na ị gụrụ ndụ m taa dịka ihe dị oke ọnụahịa. Agaghị m emejọ gị ọzọ. Nʼezie, a kpaala m agwa dịka onye nzuzu, meekwa ihe nke ukwuu na-amaghị ama.” 22Devid zara ya sị, “Lee ùbe eze, Zie otu nʼime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya. 23Onyenwe anyị na-akwụghachi nwoke ọbụla ezi omume ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m taa ma ajụla m igbu onye ya o tere mmanụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.