1 Pita 2:8
1 Peter 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.”* Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.
1 Peter 2:8 in English
1 Peter 2:8 · Berean Standard Bible
and, “A stone of stumbling and a rock of offense.”* They stumble because they disobey the word—and to this they were appointed.
Context
6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru,
“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume,
nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa.
Onye ọbụla kweere na ya,
agaghị eme ka ihere mee ya.”* 7Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ,
“Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ
nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”* 8Ọ bụ kwa,
“Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,
oke nkume nke na-eme ka ha daa.”*
Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha. 9Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube. 10Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.