Native Bible

1 Peter 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”*

1 Peter 2:6 in English

1 Peter 2:6 · Berean Standard Bible

For it stands in Scripture: “See, I lay in Zion a stone, a chosen and precious cornerstone; and the one who believes in Him will never be put to shame.”*

Context

4Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya. 5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst. 6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”* 7Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ, “Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”* 8Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.”* Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.