1 Pita 2:4
1 Peter 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya.
1 Peter 2:4 in English
1 Peter 2:4 · Berean Standard Bible
As you come to Him, the living stone, rejected by men but chosen and precious in God’s sight,
Context
2Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime nzọpụta unu. 3Ugbu a, unu detụrụla ya ire matakwa na Onyenwe anyị dị mma. 4Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya. 5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst. 6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru,
“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume,
nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa.
Onye ọbụla kweere na ya,
agaghị eme ka ihere mee ya.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.