1 Pita 2:7
1 Peter 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ, “Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”*
1 Peter 2:7 in English
1 Peter 2:7 · Berean Standard Bible
To you who believe, then, this stone is precious. But to those who do not believe, “The stone the builders rejected has become the cornerstone,”*
Context
5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst. 6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru,
“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume,
nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa.
Onye ọbụla kweere na ya,
agaghị eme ka ihere mee ya.”* 7Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ,
“Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ
nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”* 8Ọ bụ kwa,
“Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,
oke nkume nke na-eme ka ha daa.”*
Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha. 9Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.