1 Pita 2:9
1 Peter 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.
1 Peter 2:9 in English
1 Peter 2:9 · Berean Standard Bible
But you are a chosen people, a royal priesthood, a holy nation, a people for God’s own possession, to proclaim the virtues of Him who called you out of darkness into His marvelous light.
Context
7Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ,
“Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ
nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”* 8Ọ bụ kwa,
“Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,
oke nkume nke na-eme ka ha daa.”*
Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha. 9Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube. 10Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka. 11Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.