Native Bible

1 Chronicles 29:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.

1 Chronicles 29:13 in English

1 Chronicles 29:13 · Berean Standard Bible

Now therefore, our God, we give You thanks, and we praise Your glorious name.

Context

11Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. 12Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike. 13Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube. 14“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị. 15Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.