1 Ihe E Mere 29:14
1 Chronicles 29:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
1 Chronicles 29:14 in English
1 Chronicles 29:14 · Berean Standard Bible
But who am I, and who are my people, that we should be able to give as generously as this? For everything comes from You, and from Your own hand we have given to You.
Context
12Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa.
Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile.
Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị
ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike. 13Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele
na-etokwa aha gị dị ebube. 14“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị. 15Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya. 16O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.