1 Ihe E Mere 29:12
1 Chronicles 29:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
1 Chronicles 29:12 in English
1 Chronicles 29:12 · Berean Standard Bible
Both riches and honor come from You, and You are the ruler over all. In Your hands are power and might to exalt and give strength to all.
Context
10Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị,
“Otuto dịrị gị Onyenwe anyị
Chineke nna anyị Izrel
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 11Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike,
na ịma mma, na ugwu eze, na ebube,
nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị.
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze.
Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. 12Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa.
Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile.
Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị
ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike. 13Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele
na-etokwa aha gị dị ebube. 14“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.