1 Ihe E Mere 29:10
1 Chronicles 29:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị, “Otuto dịrị gị Onyenwe anyị Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
1 Chronicles 29:10 in English
1 Chronicles 29:10 · Berean Standard Bible
Then David blessed the LORD in the sight of all the assembly and said: “May You be blessed, O LORD, God of our father Israel, from everlasting to everlasting.
Context
8Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta. 9Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye Onyenwe anyị onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu. 10Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị,
“Otuto dịrị gị Onyenwe anyị
Chineke nna anyị Izrel
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 11Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike,
na ịma mma, na ugwu eze, na ebube,
nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị.
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze.
Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. 12Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa.
Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile.
Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị
ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.