Native Bible

1 Chronicles 29:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta.

1 Chronicles 29:8 in English

1 Chronicles 29:8 · Berean Standard Bible

Whoever had precious stones gave them to the treasury of the house of the LORD, under the care of Jehiel * the Gershonite.

Context

6Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye. 7Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe. 8Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta. 9Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye Onyenwe anyị onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu. 10Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị, “Otuto dịrị gị Onyenwe anyị Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.