Native Bible

1 Chronicles 29:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe.

1 Chronicles 29:7 in English

1 Chronicles 29:7 · Berean Standard Bible

Toward the service of God’s house they gave 5,000 talents * and 10,000 darics of gold,* 10,000 talents of silver,* 18,000 talents of bronze,* and 100,000 talents of iron.*

Context

5Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?” 6Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye. 7Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe. 8Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta. 9Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye Onyenwe anyị onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.