Native Bible

1 Chronicles 26:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ.

1 Chronicles 26:8 in English

1 Chronicles 26:8 · Berean Standard Bible

All these were descendants of Obed-edom; they and their sons and brothers were capable men with strength to do the work—62 in all from Obed-edom.

Context

6Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa. 7Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa. 8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ. 9E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu. 10Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.