Native Bible

1 Chronicles 26:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.

1 Chronicles 26:6 in English

1 Chronicles 26:6 · Berean Standard Bible

Also to his son Shemaiah were born sons who ruled over their families because they were strong, capable men.

Context

4Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise, 5Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm. 6Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa. 7Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa. 8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.