Native Bible

1 Chronicles 26:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).

1 Chronicles 26:10 in English

1 Chronicles 26:10 · Berean Standard Bible

Hosah the Merarite also had sons: Shimri the first (although he was not the firstborn, his father had appointed him as the first),

Context

8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ. 9E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu. 10Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ). 11Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13). 12E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.