1 Ihe E Mere 26:9
1 Chronicles 26:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu.
1 Chronicles 26:9 in English
1 Chronicles 26:9 · Berean Standard Bible
Meshelemiah also had sons and brothers who were capable men—18 in all.
Context
7Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ,
Otni, Refael, Obed na Elzabad;
ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa. 8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ. 9E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu. 10Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom:
Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ). 11Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ
na Zekaraya onye nke anọ.
Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.