Native Bible

1 Chronicles 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.

1 Chronicles 2:23 in English

1 Chronicles 2:23 · Berean Standard Bible

But Geshur and Aram captured Havvoth-jair,* along with Kenath and its sixty surrounding villages. All these were descendants of Machir the father of Gilead.

Context

21Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead. 22Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead. 23Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead. 24Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa. 25Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.