Native Bible

1 Chronicles 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.

1 Chronicles 18:14 in English

1 Chronicles 18:14 · Berean Standard Bible

Thus David reigned over all Israel and administered justice and righteousness for all his people:

Context

12Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu. 13O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 14Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. 15Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ. 16Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja. Shavsha bụ ode akwụkwọ eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.