1 Ihe E Mere 18:13
1 Chronicles 18:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
1 Chronicles 18:13 in English
1 Chronicles 18:13 · Berean Standard Bible
He placed garrisons in Edom, and all the Edomites were subject to David. So the LORD made David victorious wherever he went.
Context
11Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. 12Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu. 13O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 14Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. 15Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya;
Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.