1 Ihe E Mere 18:12
1 Chronicles 18:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu.
1 Chronicles 18:12 in English
1 Chronicles 18:12 · Berean Standard Bible
Moreover, Abishai son of Zeruiah struck down eighteen thousand Edomites in the Valley of Salt.
Context
10o zipụrụ Hadoram nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee eze Devid nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Hadoram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaedo, nke ọlaọcha na nke bronz dị iche iche bịa. 11Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. 12Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu. 13O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 14Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.