Zekaraya 7:12
Zechariah 7:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe.
Zechariah 7:12 in English
Zechariah 7:12 · Berean Standard Bible
They made their hearts like flint and would not listen to the law or to the words that the LORD of Hosts had sent by His Spirit through the earlier prophets. Therefore great anger came from the LORD of Hosts.
Context
10Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’ 11“Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị. 12Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe. 13“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 14‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’ ”
7:7 Ya bụ, ndị Jụụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.