Native Bible

Zechariah 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Zechariah 7:13 in English

Zechariah 7:13 · Berean Standard Bible

And just as I had called and they would not listen, so when they called I would not listen, says the LORD of Hosts.

Context

11“Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị. 12Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe. 13“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 14‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’ ” 7:7 Ya bụ, ndị Jụụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.