Native Bible

Zechariah 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị.

Zechariah 7:11 in English

Zechariah 7:11 · Berean Standard Bible

But they refused to pay attention and turned a stubborn shoulder; they stopped up their ears from hearing.*

Context

9“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko. 10Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’ 11“Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị. 12Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe. 13“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.