Zekaraya 7:14
Zechariah 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’ ” 7:7 Ya bụ, ndị Jụụ
Zechariah 7:14 in English
Zechariah 7:14 · Berean Standard Bible
But I scattered them with a whirlwind among all the nations that they had not known, and the land was left desolate behind them so that no one could come or go. Thus they turned the pleasant land into a desolation.”
Context
12Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe. 13“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 14‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’ ”
7:7 Ya bụ, ndị Jụụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.