Zekaraya 11:3
Zechariah 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ, e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha. Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm, nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan.
Zechariah 11:3 in English
Zechariah 11:3 · Berean Standard Bible
Listen to the wailing of the shepherds, for their glory is in ruins. Listen to the roaring of the young lions, for the thickets of the Jordan are destroyed.
Context
1Meghee ọnụ ụzọ gị niile, gị Lebanọn.
Ka ọkụ repịa osisi sida gị niile. 2Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala,
nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke.
Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan,
nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ! 3Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ,
e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha.
Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm,
nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan. 4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri. 5Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.