Zekaraya 11:4
Zechariah 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri.
Zechariah 11:4 in English
Zechariah 11:4 · Berean Standard Bible
This is what the LORD my God says: “Pasture the flock marked for slaughter,
Context
2Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala,
nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke.
Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan,
nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ! 3Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ,
e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha.
Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm,
nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan. 4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri. 5Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha. 6Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.