Native Bible

Song of Songs 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.

Song of Songs 7:4 in English

Song of Songs 7:4 · Berean Standard Bible

Your neck is like a tower made of ivory; your eyes are like the pools of Heshbon by the gate of Bath-rabbim; your nose is like the tower of Lebanon, facing toward Damascus.

Context

2Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu. 3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge. 4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu. 5Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo.* Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha. 6Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.