Native Bible

Song of Songs 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.

Song of Songs 7:6 in English

Song of Songs 7:6 · Berean Standard Bible

How fair and pleasant you are, O love, with your delights!

Context

4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu. 5Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo.* Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha. 6Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma. Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya. 7Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ; ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi. 8Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ, jidekwa mkpụrụ ya aka.” Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị, ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.