Abụ nke Abụ 7:5
Song of Songs 7:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel. Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo.* Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.
Song of Songs 7:5 in English
Song of Songs 7:5 · Berean Standard Bible
Your head crowns you like Mount Carmel, the hair of your head like purple threads; the king is captured in your tresses.
Context
3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ
nke otu nne mụrụ nʼotu oge. 4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo.
Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn
nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim.
Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn
nke chere Damaskọs ihu. 5Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel.
Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo.*
Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha. 6Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma.
Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya. 7Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ;
ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.