Native Bible

Song of Songs 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu.

Song of Songs 7:2 in English

Song of Songs 7:2 · Berean Standard Bible

Your navel is a rounded goblet; it never lacks blended wine. Your waist is a mound of wheat encircled by the lilies.

Context

1Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ gị ada nwa eze. Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa, ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka. 2Otubo gị mara mma dịka iko nke a gbajuru mmanya. Ukwu gị dị ka ukwu ọka e ji okoko urodi gbaa gburugburu. 3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ nke otu nne mụrụ nʼotu oge. 4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo. Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim. Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn nke chere Damaskọs ihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.