Abụ nke Abụ 7:11
Song of Songs 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo, ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.
Song of Songs 7:11 in English
Song of Songs 7:11 · Berean Standard Bible
Come, my beloved, let us go to the countryside; let us spend the night among the wildflowers.*
Context
9ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. 10(9) Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya,
na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.
(10) Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya,
ọ bụkwa m ka ọ chọrọ. 11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo,
ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta. 12Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi
lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru,
ma okoko ya agbawaala,
ma osisi pomegranet agbawaala okoko.
Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m. 13Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki* na-ewepụta;
mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị,
ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie,
nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.
7:5 Ihe akpara akpa nke e jiri mara onye a na-enye nsọpụrụ
7:13 Dịka ndị mmadụ na-ekwu, mandreki na-eweta mkpali ọchịchọ mmekọrịta nʼahụ mmadụ, na-emekwa ka nwanyị tara ya tụrụ ime. Jen 30:14
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.