Abụ nke Abụ 7:10
Song of Songs 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
(9) Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya, na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya. (10) Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.
Song of Songs 7:10 in English
Song of Songs 7:10 · Berean Standard Bible
(9) May it flow smoothly to my beloved, gliding gently over lips and teeth.* (10) I belong to my beloved, and his desire is for me.
Context
8Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ,
jidekwa mkpụrụ ya aka.”
Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị,
ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl, 9ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma. 10(9) Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya,
na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.
(10) Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya,
ọ bụkwa m ka ọ chọrọ. 11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo,
ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta. 12Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi
lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru,
ma okoko ya agbawaala,
ma osisi pomegranet agbawaala okoko.
Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.