Abụ nke Abụ 6:11
Song of Songs 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
Song of Songs 6:11 in English
Song of Songs 6:11 · Berean Standard Bible
I went down to the walnut grove to see the blossoms of the valley, to see if the vines were budding or the pomegranates were in bloom.
Context
9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.
Naanị otu nwanyị nne ya nwere,
ọ masịrị onye mụrụ ya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,
ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya. 10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,
nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,
dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị? 11Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,
ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,
ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,
na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru. 12Tupu m mata ebe m nọ,
agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m. 13Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;
laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.