Abụ nke Abụ 6:9
Song of Songs 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.
Song of Songs 6:9 in English
Song of Songs 6:9 · Berean Standard Bible
but my dove, my perfect one, is unique, the favorite of the mother who bore her. The maidens see her and call her blessed; the queens and concubines sing her praises.
Context
7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet e kere abụọ. 8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,
na iri ndị iko nwanyị asatọ,
na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, 9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.
Naanị otu nwanyị nne ya nwere,
ọ masịrị onye mụrụ ya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,
ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya. 10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,
nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,
dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị? 11Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,
ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,
ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,
na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.