Native Bible

Song of Songs 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,

Song of Songs 6:8 in English

Song of Songs 6:8 · Berean Standard Bible

There are sixty queens and eighty concubines, and maidens without number,

Context

6Eze gị dị ka igwe atụrụ nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha. 7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ. 8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, 9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya. 10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.