Abụ nke Abụ 6:8
Song of Songs 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,
Song of Songs 6:8 in English
Song of Songs 6:8 · Berean Standard Bible
There are sixty queens and eighty concubines, and maidens without number,
Context
6Eze gị dị ka igwe atụrụ
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha. 7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet e kere abụọ. 8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,
na iri ndị iko nwanyị asatọ,
na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, 9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.
Naanị otu nwanyị nne ya nwere,
ọ masịrị onye mụrụ ya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,
ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya. 10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,
nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,
dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.