Native Bible

Ruth 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị,

Ruth 3:16 in English

Ruth 3:16 · Berean Standard Bible

When Ruth returned to her mother-in-law, Naomi asked her, “How did it go, my daughter?” Then Ruth told her all that Boaz had done for her.

Context

14Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.” 15O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo. 16Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị, 17“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ” 18Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.” 3:3 Ọ bụ ọrụ ụmụ anụmanụ ịzọcha ọka nʼoge ehihie. Ma nʼoge uhuruchi, mgbe ikuku nʼefe, ndị ọrụ ubi na-eji ihe dịka nkata na-awụli ọka ahụ elu nʼihi ịyọcha ya. Dịka ha na-awụli ya elu, ikuku na-ebufu igbugbo ọka na ahịhịa, ma mkpụrụ ọka na-adịgide nʼime nkata ahụ. 3:9 Mgbe nwoke were akwa, maọbụ ọnụ akwa gbasaa nwanyị nʼahụ, nke a na-egosi na ọ chọrọ ịlụ ya. Izk 16:8

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.