Rut 3:17
Ruth 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ”
Ruth 3:17 in English
Ruth 3:17 · Berean Standard Bible
And she said, “He gave me these six measures of barley, for he said, ‘Do not go back to your mother-in-law empty-handed.’”
Context
15O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo. 16Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?”
Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị, 17“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ” 18Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.”
3:3 Ọ bụ ọrụ ụmụ anụmanụ ịzọcha ọka nʼoge ehihie. Ma nʼoge uhuruchi, mgbe ikuku nʼefe, ndị ọrụ ubi na-eji ihe dịka nkata na-awụli ọka ahụ elu nʼihi ịyọcha ya. Dịka ha na-awụli ya elu, ikuku na-ebufu igbugbo ọka na ahịhịa, ma mkpụrụ ọka na-adịgide nʼime nkata ahụ.
3:9 Mgbe nwoke were akwa, maọbụ ọnụ akwa gbasaa nwanyị nʼahụ, nke a na-egosi na ọ chọrọ ịlụ ya. Izk 16:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.