Native Bible

Ruth 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.

Ruth 3:15 in English

Ruth 3:15 · Berean Standard Bible

And he told her, “Bring the shawl you are wearing and hold it out.” When she did so, he shoveled six measures of barley * into her shawl. Then he went * into the city.

Context

13Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.” 14Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.” 15O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo. 16Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị, 17“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.